Skip to content
Home » Sir Jude Nnam » Sir Jude Nnam – Som Too Chukwu Lyrics

Sir Jude Nnam – Som Too Chukwu Lyrics

    Lyrics for Som Too Chukwu By Sir Jude Nnam

    Chukw’okike, ked’ihe mg’enye Gi?
    Ked’ihem ga-emere Chineke, Odogwu n’agha
    Is’iyi nke ndu m o
    Agada gbachiri uzo, Chukwu
    :Nkenk’iyi n’ebu ogwe, abu oma k’anyi ji bia
    N’ihu Gi, Chineke
    Abu otito k’anyi ji bia ezi Chukwu.

    Soro m n’eto Ya, n’odimma
    Soro m tobe Ya n’odimma
    A gam ako ihe Chukwu mere mo
    I huru m n’anya, Chukwu
    Soro m too Chukwu
    Eh! Onazo mo! Elegh’anya n’azu
    N’ime mkpam ka mbekuru Gi
    Okw’izara mo
    Chineke, onye di ka Gi, Ez’igwe
    O! abu otito ka m g’eji wee kele Gi
    O! abu otito ka m g’eji jaa Gi mma—
    O- Chineke n’idi mma
    Ebube Gi di ukwu

    SOM TOO CHUKWU (Bass-chorus)
    Soro m tobe Chukwu, tobenna tobenna
    Soro m tobe Nna, Oh tobenna tobenna
    Mkpur’obi m tobe Chukwu, tobenna tobenna
    Mkpur’obi m tobenna Oh tobenna tobenna
    : Sorom too Chukwu, Onalu olu ebube
    Sorom tobe Chineke Nna mo n’odi ukwu
    Sorom tobe Chukwu, tobenna tobenna
    Sorom tobe Nna Oh tobenna tobenna
    Mkpur’obim tobe Chukwu, tobenna tobenna
    Mkpur’obim tobenna Oh tobenna, Tobe Onye Ukwu!!

    Taraba dib dib, Taraba dib dib,
    Teberebe dib, dib dib

    Other Sir Jude Nnam Lyrics [display-posts category=”Sir Jude Nnam” exclude_current=”true”]

    Leave a Reply

    Your email address will not be published. Required fields are marked *